Psalms 106

Toonu Chineke onye ebere

1Toonu Onyenwe anyị.

Keleenụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ dị mma;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

2Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke Onyenwe anyị na-arụ
maọbụ kwupụta otuto ya niile?
3Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi,
ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile.

4O Onyenwe anyị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma,
bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha,
5ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara,
ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị
sorokwa ihe nketa gị nye otuto.

6Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere;
anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume.
7Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt,
ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile;
ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile,
kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie.
8Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya,
ime ka a mara ike ya dị ukwuu.
9Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa;
o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
10Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị;
gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile;
ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile,
ma bụkuo gị abụ otuto.

13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ,
ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha;
nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
15Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya,
ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.

16Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis
na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
17Ala meghere loda Datan,
o likwara Abiram, na ndị otù ya.
18Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha;
ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi,
kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa
gbanwere Ebube ha.
21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha,
onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham,
na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
23Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi,
ma Mosis, onye ya ọ họpụtara,
guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke,
ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.

24Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya,
ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha;
ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.
26Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi
na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara,
27mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche,
ma chụsasịa ha nʼala niile.

28Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa,
riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
29ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe,
nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi,
ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya
site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe,
nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
33nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke,
Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.

34Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ
dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.
35Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ,
site otu a, mụta ime ka ha na-eme.
36Ha fere arụsị ha ofufe,
nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.
37Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị
inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.
Maọbụ, ajọ mmụọ

38Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla,
ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom,
bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan,
si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.
39Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha;
site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.

40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya;
ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.
41Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche,
ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.
42Ndị iro ha mekpara ha ahụ
chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha,
ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya,
bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
44Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha,
ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
45nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya,
sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
46Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha
nwee ọmịiko nʼahụ ha.

47O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị,
chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche,
ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele
ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.


48Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel,
site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.

Ka mmadụ niile sị, “Amen!”

Toonu Onyenwe anyị.
Copyright information for IboBIU